2. Samuel 3:8-22 Bible Nso (IGBOB)

8. Iwe Abnea we di ọku nke-uku n'ihi okwu Ish-boshet, ọ si, Ọ̀ bu isi nkita nke ulo Juda nwere ka m'bu? Ta ka m'nēmere ulo Sọl, bú nna-gi, nēme-kwa-ra umu-nne-ya, nēme-kwa-ra ndi-eyì-ya, ebere, emeghkwam ka i rue Devid aka, ma i nēbom ebubo ajọ omume bayere nwayi a ta.

9. Chineke me Abnea otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, ma asi na emereghm Devid ọbuná otú a, bú dika Jehova ṅuworo ya iyi;

10. ime ka ala-eze si n'ulo Sọl gabiga, na ime ka oche-eze Devid guzosie ike n'elu Israel na n'elu Juda, site na Dan we rue na Bia-sheba.

11. Ma ọ pughi izaghachi Abnea okwu ọzọ, n'ihi na ọ turu egwu ya.

12. Abnea we zigara Devid ndi-ozi n'ọnọdu ya, si, Ònye nwe ala? ọ si-kwa-ra, Ka mu na gi b͕a ndu, ma, le, akam gādiri gi, ime ka Israel nile chigharia biakute gi.

13. Ọ we si, Ọ di nma; mu onwem na gi gāb͕a ndu: nání, otù ihe ka mu onwem nāju n'aka-gi, si, I gaghi-ahu irum, ma ọ buru na i bughi uzọ me ka Maikal nwa Sọl bia, mb͕e i gābia ihu irum.

14. Devid we zigara Ish-boshet nwa Sọl ndi-ọzi, si, Nyem nwunyem, bú Maikal, onye m'ji ọgu api ise nke ndi Filistia lutara onwem.

15. Ish-boshet we ziga, nara ya n'aka di-ya, bú n'aka Paltiel nwa Laish.

16. Di-ya we soro ya je, nēje nākwa ákwá n'azu ya rue Bahurim. Abnea we si ya, Je, laghachi: o we laghachi.

17. Okwu Abnea we diyere ndi-okenye Israel, si, Na mb͕e gara aga unu nāchọ Devid ka ọ buru eze-unu:

18. Ma ub͕u a menu ya: n'ihi na Jehova ekwuwo okwu bayere Devid, si, M'gēwere aka Devid, bú orùm, zọputa ndim, bú Israel, n'aka ndi Filistia, na n'aka ndi-iro-ha nile.

19. Abnea kwu-kwa-ra na nti Benjamin: Abnea we je kwa ikwu na nti Devid nime Hebron ihe nile nke di nma n'anya Israel, na n'anya ulo Benjamin nile.

20. Abnea we biakute Devid rue Hebron, ya na orú ndikom. Devid we mere Abnea, me-kwa-ra ndikom soro ya, oké oriri.

21. Abnea we si Devid, Ka m'bilie je chikọtara onye-nwem, bú eze, Israel nile, ka gi na ha we b͕a ndu, ka i we buru kwa eze ndi nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike. Devid we zilaga Abnea, o we la n'udo.

22. Ma, le, ndi-orù Devid na Joab si n'usu ndi nāpunara madu ihe bia, ọ bu kwa ọtutu ihe-nkwata ka ha bubatara n'aka ha: ma Abnea anọyeghi Devid nime Hebron; n'ihi na o zilagawo ya, o we la n'udo.

2. Samuel 3