2. Samuel 3:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. Ọ we si, Ọ di nma; mu onwem na gi gāb͕a ndu: nání, otù ihe ka mu onwem nāju n'aka-gi, si, I gaghi-ahu irum, ma ọ buru na i bughi uzọ me ka Maikal nwa Sọl bia, mb͕e i gābia ihu irum.

14. Devid we zigara Ish-boshet nwa Sọl ndi-ọzi, si, Nyem nwunyem, bú Maikal, onye m'ji ọgu api ise nke ndi Filistia lutara onwem.

15. Ish-boshet we ziga, nara ya n'aka di-ya, bú n'aka Paltiel nwa Laish.

16. Di-ya we soro ya je, nēje nākwa ákwá n'azu ya rue Bahurim. Abnea we si ya, Je, laghachi: o we laghachi.

17. Okwu Abnea we diyere ndi-okenye Israel, si, Na mb͕e gara aga unu nāchọ Devid ka ọ buru eze-unu:

18. Ma ub͕u a menu ya: n'ihi na Jehova ekwuwo okwu bayere Devid, si, M'gēwere aka Devid, bú orùm, zọputa ndim, bú Israel, n'aka ndi Filistia, na n'aka ndi-iro-ha nile.

19. Abnea kwu-kwa-ra na nti Benjamin: Abnea we je kwa ikwu na nti Devid nime Hebron ihe nile nke di nma n'anya Israel, na n'anya ulo Benjamin nile.

2. Samuel 3