9. Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro:
10. onye ahu biliri, tib͕u ndi Filistia rue mb͕e ike gwuru aka-ya, aka-ya we rapara na mma-agha: Jehova we zọputa nzọputa uku n'ubọchi ahu; ndi Israel we laghachi soro ya n'azu nání iyipu ihe di n'aru ndi eb͕uru eb͕u.
11. Nke so ya bu Shama nwa Agi onye-Hararait. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha n'usu, ma òkè ubi di n'ebe ahu juputara na lentil; ma ndi Israel b͕apuru n'iru ndi Filistia.
12. O we guzo onwe-ya n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia: Jehova we zọputa nzọputa uku.