2. Samuel 23:21-39 Bible Nso (IGBOB)

21. Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, bú nwoke mara nma ile anya: ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya.

22. Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu.

23. Anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu. Devid we do ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-ya.

24. Asahel nwa-nne Joab bu otù onye n'etiti orú ndikom na iri ahu; Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;

25. Shama onye Harod, Elika onye Harod;

26. Hilez onye-Paltait, Ira nwa Ikesh onye Tekoa;

27. Abieza onye Anatot, Mebunai onye Husha;

28. Zalmon onye Ahoa, Maharai onye Netofa;

29. Hileb nwa Beana onye Netofa, Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin;

30. Benaia onye Piraton, Hidai nke miri-iyi Gaash;

31. Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim;

32. Eliahba onye Shaalabin, nke umu Jashen, Jonatan;

33. Shama onye-Hararait, Ahiam nwa Shara onye-Ararait;

34. Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo;

35. Hezro onye Kamel, Paarai onye Arab;

36. Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad;

37. Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia;

38. Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta;

39. Uraia onye Het: ha nile di orú ndikom na iri na asa.

2. Samuel 23