2. Samuel 22:43-49 Bible Nso (IGBOB)

43. Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.

44. I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.

45. Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum:Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti.

46. Ndi ala ọzọ nāta aru,Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta.

47. Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:

48. Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum,

49. Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua:I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike.

2. Samuel 22