42. Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.
43. Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.
44. I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.