2. Samuel 22:38-42 Bible Nso (IGBOB)

38. Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha;Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.

39. M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:Ha we da n'okpuru ukwum abua.

40. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.

41. Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.

42. Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.

2. Samuel 22