30. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe:Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.
31. Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
32. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
33. Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:Ọ nākwazu kwa uzọm.
34. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.
35. O nēzí akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
36. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
37. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
38. Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha;Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
39. M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:Ha we da n'okpuru ukwum abua.
40. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
41. Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.