3. Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam;Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike.
4. Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova,Ewe zọputam n'aka ndi-irom.
5. N'ihi na ebili-miri nke ọnwu b͕aram buruburu,Miri-iyi nile nke jọb͕uru onwe-ya nēme ka m'tua egwu.
6. Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu;Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.
7. Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,Ọ bu Chinekem ka m'nākpọku:O we si n'ulo uku Ya nu olum,Nkpu m'tikuru Ya ba-kwa-ra na nti-Ya abua.
8. Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji,Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.
9. Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya,Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia:Afunwuru icheku site na ya.
10. O rulata-kwa-ra elu-igwe, rida;Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.