21. Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di:Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.
22. N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova,Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem.
23. N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum:Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n'ebe ha di.
24. M'we zue okè n'ebe Ọ nọ,Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajọ omumem.
25. Jehova we meghachim dika ezi omumem si di;Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di.
26. N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere,N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
27. N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.
28. I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala:Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala.
29. N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova:Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
30. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe:Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.
31. Chineke, uzọ-Ya zuru okè:Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
32. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
33. Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:Ọ nākwazu kwa uzọm.