18. Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim
19. Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:Ma Jehova burum ihe-ndabere.
20. O we me ka m'puta rue ebe sara mbara:Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.
21. Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di:Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.