12. O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu,Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.
13. Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru YaAfunwuru icheku ọku.
14. Jehova si n'elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe,Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da.
15. O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;Àmùmà kwa, O we chusa ha.
16. Ewe hu ebe osimiri si erù,Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,N'ibasi-nba-ike nke Jehova,Site n'ume nke iku-ume nke imi-Ya.
17. O si n'elu zìe, kurum,Dọputam n'ọtutu miri;
18. Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim
19. Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:Ma Jehova burum ihe-ndabere.