2. Samuel 22:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n'ọbu-aka Sọl:

2. ọ we si,Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m'b͕apu, Onye m'nwere;

3. Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam;Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike.

4. Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova,Ewe zọputam n'aka ndi-irom.

5. N'ihi na ebili-miri nke ọnwu b͕aram buruburu,Miri-iyi nile nke jọb͕uru onwe-ya nēme ka m'tua egwu.

6. Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu;Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.

7. Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,Ọ bu Chinekem ka m'nākpọku:O we si n'ulo uku Ya nu olum,Nkpu m'tikuru Ya ba-kwa-ra na nti-Ya abua.

8. Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji,Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.

9. Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya,Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia:Afunwuru icheku site na ya.

10. O rulata-kwa-ra elu-igwe, rida;Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.

11. O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we fere:Ewe hu Ya n'elu nkù ìfùfè.

12. O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu,Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.

13. Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru YaAfunwuru icheku ọku.

14. Jehova si n'elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe,Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da.

2. Samuel 22