2. Samuel 2:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, ka nka gasiri, na Devid juru Jehova ese, si, M'gārigo n'otù nime obodo Juda? Jehova we si ya, Rigo. Devid we si, Òle ebe M'gārigo? Ọ si, Rue Hebron.

2. Devid we rigo n'ebe ahu, ya na ndinyom-ya abua kwa, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail, bú nwunye Nebal onye Kamel.

3. Ndikom ndi ya na ha nọ ka Devid me-kwa-ra ka ha rigota, nwoke ọ bula na ulo-ya: ha we biri n'obodo nile nke Hebron.

4. Ndikom Juda we bia te Devid manu n'ebe ahu ibu eze ulo Juda.Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl.

2. Samuel 2