29. Eze we si ya, N'ìhi gini ka i nēkwu okwu bayere okwu-gi nile ọzọ? Asiwom, Gi onwe-gi na Ziba gēkè ubi ahu.
30. Mefiboshet we si eze, E, ya were ihe nile, ebe onye-nwem, bú eze, biaworo n'ulo-ya n'udo.
31. Bazilai, bú onye Gilead, we si na Rogelim rida; o we soro eze gabiga Jọdan, izilaga ya n'ofè Jọdan.
32. Ma Bazilai mere agadi nke-uku, ọ b͕ara ọgu arọ anọ: ya onwe-ya zù-kwa-ra eze mb͕e ọ nānọdu na Mahanaim; n'ihi na oké madu ka ọ bu nke-uku.
33. Eze we si Bazilai, Gi onwe-gi sorom gabiga, m'gāzù kwa gi n'ebe m'nọ na Jerusalem.
34. Bazilai we si eze, Ùbọchi arọ nke ndum di ole, m'gēji soro eze rigorue Jerusalem?