19. Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m'b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n'aka ndi-iro-ya.
20. Joab we si ya, Ọ bughi onye ozi ọma ka i gābu ta, kama i gēzi ozi ọma ubọchi ọzọ: ma ta i gaghi-ezí ozi ọma, n'ihi na nwa eze anwuwo.
21. Joab we si onye Kush, Je gosi eze ihe i huworo. Onye Kush ahu we kpọ isi ala nye Joab, b͕a ọsọ.
22. Ahimaaz nwa Zedok we si kwa Joab ọzọ, Ma otú ọ di, biko, ka m'b͕a ọsọ, mu onwem kwa, n'azu onye Kush. Joab we si, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi ganāb͕a ọsọ, nwam, ma ọ dighi ozi ọma ahutara gi.
23. Ma otú ọ di, m'gāb͕a ọsọ, ka o kwuru. Ọ si ya, B͕a ọsọ. Ahimaaz we b͕a ọsọ Buruburu-ala, b͕abiga onye Kush ahu.
24. Ma Devid nānọdu n'etiti ọnu-uzọ-ama abua ahu: onye-nche we jerue elu-ulo ọnu-uzọ-ama rue mbidi obodo, we welie anya-ya, hu, ma, le, otù nwoke nāb͕a ọsọ nání ya.
25. Onye-nche we kpọ òkù, gosi eze. Eze we si, Ọ buru na ọ bu nání ya, ozi ọma di n'ọnu-ya. O we bia si-ike, biarue nso.
26. Onye-nche we hu nwoke ọzọ ka ọ nāb͕a ọsọ: onye-nche we kpọ onye nēche ọnu-uzọ òkù, si, le, nwoke ọzọ nāb͕a ọsọ, nání ya. Eze we si, Onye ahu nēzi kwa ozi ọma.