2. Samuel 17:12-14 Bible Nso (IGBOB)

12. Ayi gābiakute kwa ya n'otù nime ọnọdu ebe agāchọta ya, ayi onwe-ayi gādakwasi kwa ya dika igirigi nādakwasi n'ala: ayi agaghi-eme kwa ka ọbuná otù onye fọdu n'etiti ya na n'etiti ndikom nile ndi ya na ha nọ.

13. Ma ọ buru na achikọta ya n'otù obodo, agēme kwa ka Israel nile chita udọ̀ n'obodo ahu, ayi gādọ kwa ya rue miri-iyi, rue mb͕e agaghi-ahuta ọbuná otù ajirija nkume n'ebe ahu.

14. Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.

2. Samuel 17