2. Samuel 16:12-16 Bible Nso (IGBOB)

12. Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n'ọnọnọdu nkọcha-ya ta.

13. Devid na ndikom-ya we je n'uzọ ahu: Shimai nēje kwa n'akuku ugwu na ncherita-iru ya, ọ nēje ije we kọcha, tu kwa nkume na ncherita-iru ya, kpoli kwa ájá.

14. Eze na ndi nile ndi ya na ha yikọrọ je, we biarue Ayefim; o we turu ndu n'ebe ahu.

15. Absalom na ndi nile, bú ndikom Israel, we ba na Jerusalem, Ahitofel so-kwa-ra ya ba.

16. O rue, mb͕e Hushai, bú onye-Akait, bú eyì Devid, biakutere Absalom, na Hushai siri Absalom, Ka eze di ndu, ka eze di ndu.

2. Samuel 16