2. Samuel 1:10-21 Bible Nso (IGBOB)

10. M'we guzo n'akuku ya, me ka ọ nwua, n'ihi na amaram na ọ gaghi-adi ndu mb͕e ọ dasiri: m'were okpu-eze nke di n'isi-ya, na ọla-aka nke di n'ogwe-aka-ya, we chitara ha onye-nwem n'ebe a.

11. Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra.

12. Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha.

13. Devid we si nwa-okorọbia nēgosi ya, Òle ebe i si bia? Ọ si Nwa ọbìa, bú onye Amalek, ka m'bu.

14. Devid we si ya, Ì si aṅa ghara itu egwu iseti aka-gi ibibi onye Jehova etere manu?

15. Devid we kpọ otù nime umu-okorọbia, si, Jerue nso, dakwasi ya. O we tib͕ue ya, o we nwua.

16. Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.

17. Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:

18. Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n'akwukwọ Jasha.

19. Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi!Ndi-dike esiwo aṅa da!

20. Unu egosila ya nime Gat,Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon;Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu,Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.

21. Unu ugwu Gilboa,Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli:N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi,Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.

2. Samuel 1