4. N'ihi na asi na Chineke emereghi ndi-mọ-ozi ebere mb͕e ha mehiere, kama Ọ tubàra ha n'ime-ime ọku ala-mọ, we rara ha nye n'olùlù nke ọchichiri, ka ewe debe ha ikpe ikpé;
5. asi kwa na O mereghi uwa ochie ebere, kama ọ bu Noa, onye mere ha asatọ, bú onye nēkwusa ezi omume, ka O chere, mb͕e O mere ka iju-miri biakwasi uwa nke ndi nādighi-asọpuru Chineke;
6. O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke;
7. O we dọputa Lot, bú onye ezi omume, mb͕e ibi-obi n'agu ikwa-iko nke ndi ahu ndi nēmebi iwu nēwuta ya nke-uku
8. (n'ihi na onye ezi omume ahu, ebe o nēbi n'etiti ha, o were ọlu-ha nke nēmebi iwu mekpa nkpuru-obi ezi omume ya aru kwa-ubọchi, n'ile ihe na inu ihe):
9. Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;
10. ma nke kachasi ndi nējeso anu-aru n'agu ihe emeruru emeru, ndi nēlelì kwa ibu-onye-nwe-madu anya. Ndi nwere anya-ike, ndi nwere isi-ike, ha amaghi aru jijiji ikwulu ndi nọ n'ebube:
11. ebe ndi-mọ-ozi, ọ bu ezie na ha ka ha n'ume na ike, ma ha ekpegideghi ha ikpé nkwulu n'iru Onye-nwe-ayi.
12. Ma ndia, dika anu nēnweghi uche, ndi bu anu nzuzu site n'ọmumu-ha inwude na imebi, nēkwulu Chineke n'ihe ha nāmaghi, agēmebi kwa ndia na nmehie ha,
13. ndi anēmejọ ha dika ugwọ-ọlu nke ajọ omume; madu ndi nāgu ya n'ihe-utọ, bú ibi n'oké oriri na oké ọṅuṅu n'ehihie, ndi bu ntupọ na ihe-ita-uta, nānọ n'oké oriri na oké ọṅuṅu n'oriri ihu-n'anya ha mb͕e ha nēso unu rikọ ihe;
14. ha bu ndi nwere anya nke juputara n'aru nwanyi nākwa iko, anya nke nāpughi kwa ighara imehie; ha bu kwa ndi nārafu nkpuru-obi ndi nādighi-eguzosi ike; ha nwekwara obi anwaputaworo n'anya-uku; buru kwa umu nke ọbubu-ọnu;