9. N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.
10. Na nka ka m'nēnye kwa ìzùm: n'ihi na nka nābara unu urù, madu ndi buru uzọ malite n'arọ gara aga, ọ bughi nání ime eme, kama ichọ kwa achọ.
11. Ma ub͕u a mezu-kwa-nu omume ahu; ka, dika obi di ọku ichọ achọ diri unu, ka ewe site n'ihe unu nwere mezu kwa ya otú a.
12. N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi.
13. N'ihi na ekwughm nka, ka o we di ndi ọzọ nfé, ka nkpab͕u we di-kwa-ra unu:
14. kama anamekwu n'uzọ nrata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọduru ha inwe n'oge di ub͕u a, ka ihe ndi ahu nwebigara ókè we meju kwa ihe fọduru unu inwe; ka nrata we di:
15. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya; onye chikọta-kwa-ra ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe.
16. Ma ekele diri Chineke, Onye nētiye otù inu-ọku ahu n'ihi unu n'obi Taitọs.
17. N'ihi na ọ nara aririọ-ayi nke-ọma n'ezie; ma ebe ọ nānu ọku n'obi kari ihe m'chère, o siri n'ebe a pua jekuru unu dika o zuputara n'onwe-ya.
18. Ayi ezìkọwo kwa ya na nwa-nna-ayi ahu onye otuto-ya n'ozi ọma ayi ruzuru nzukọ Kraist nile;
19. ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n'ije ije n'amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi: