9. N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.
10. Na nka ka m'nēnye kwa ìzùm: n'ihi na nka nābara unu urù, madu ndi buru uzọ malite n'arọ gara aga, ọ bughi nání ime eme, kama ichọ kwa achọ.
11. Ma ub͕u a mezu-kwa-nu omume ahu; ka, dika obi di ọku ichọ achọ diri unu, ka ewe site n'ihe unu nwere mezu kwa ya otú a.
12. N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi.