2. Ndi Kọrint 3:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. N'ihi na asi na ije-ozi nke ọmuma-ikpé bu ebube, ije-ozi nke ezi omume gēnwebiga ebube ókè kari nke-uku.

10. N'ihi na ihe emeworo ka ọ di ebube, emeghi ya ka ọ di ebube n'akuku a n'ezie, n'ihi ebube ahu nke kariri nke-uku.

11. N'ihi na asi na ihe anēme ka ọ ghara idi irè ji ebube bia, ihe nādigide dikariri n'ebube nke-uku.

12. Ya mere ebe ayi nwere olile-anya di otú a, ayi nēkwuwa okwu nke-uku,

13. ayi adighi kwa ka Moses, onye nēkpudo ihe-nkpudo n'iru-ya, ka umu Israel we ghara ilegide anya rue ọgwugwu ihe ahu anēme ka ọ ghara idi irè:

14. ma emere ka uche-ha ma etili: n'ihi na rue ubọchi ta n'ọgugu ọb͕ub͕a-ndu ochie otù ihe-nkpudo ahu nādigide, ebe anēkpugheghi na anēme ya ka ọ ghara idi irè nime Kraist.

2. Ndi Kọrint 3