10. N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.
11. Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n'ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n'ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula.
12. Ewere ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube na ọlu di ike di iche iche luputa ihe-iriba-ama nile nke onye-ozi n'etiti unu ezie na ntachi-obi nile.
13. N'ìhi na gini bu ihe ahu nke emere ka unu la ala nime ya kari nzukọ Kraist fọduru, ma-ọbughi na mu onwem abughi unu ibu arọ́? b͕agharanum ajọ omume a.
14. Le, nka bu ub͕ò nke-atọ m'nọ dika onye edoziworo ibiakute unu; m'gaghi-abu kwa ibu arọ́: n'ihi na achọghi m ihe-unu, kama ọ bu unu onwe-unu: n'ihi na ọ bughi ọlu umu ikpadoro ndi muru ha ihe, kama ọ bu ọlu ndi muru umu ikpadoro umu-ha.
15. Ma mu onwem gēwere obi-utọ nile mefu ihe m'nwere kwe kwa ka emefusia mu onwem n'ihi nkpuru-obi-unu. Ọ buru na anamahubiga unu n'anya ókè kari, ànāhum n'anya nke-ntà kari?
16. Ma ka ọ di otú a, mu onwem eboghi unu ibu arọ́; kama, ebe m'bu onye-aghughọ, ejim itu-ntu nwude unu.
17. Ọ̀ gābu na esim n'aka onye ọ bula n'etiti ndi m'ziteworo unu rib͕u unu?
18. Ariọrọm Taitọs, ziga kwa nwa-nna-ayi ahu ka o so ya. Ọ̀ gābu na Taitọs rib͕uru unu n'uzọ ọ bula? àyi eweghi otù Mọ ahu jeghari? àyi esoghi n'otù ije-ukwu ahu?
19. Unu nēchè oge nile a na ayi nāgọpu onwe-ayi nye unu. Ọ bu n'iru Chineke nime Kraist ka ayi nēkwu. Ma ihe nile bu n'ihi iwuli unu elu dika ulo, ndi m'huru n'anya.
20. N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi;
21. ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia ọzọ, Chinekem gēwedam n'ala n'iru unu, m'ru-kwa-ra ọtutu madu újú n'etiti ndi mehieworo n'oge gara aga, ha echègharighi kwa n'adighi-ọcha na ikwa-iko na agu ikwa-iko nke ha mere.