1. Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n'Akaia dum:
2. Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
3. Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;
4. Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.
5. N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist.
6. Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa: