Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.