3. Ọ si, Je, riọtara onwe-gi ihe n'èzí n'aka ndi-ab͕ata-obi-gi nile, bú ihe ihe nādighi nime ha; ha abula ole-na-ole.
4. I gābà kwa n'ulo, mechibido onwe-gi, mechibido kwa umu-gi ndikom, uzọ, b͕aye manu di n'ite ahu n'ihe ahu nile, buzuga nke juru eju.
5. O we si n'ebe ọ nọ la, mechibido onwe-ya, mechibido kwa umu-ya ndikom, uzọ; ha onwe-ha nēbutere ya ihe ahu nso, ma ya onwe-ya nāb͕aye ab͕aye.
6. O rue, mb͕e ihe nile juru, na ọ siri nwa-ya, Buterem nso ihe ọzọ. Ọ si ya, Ọ dighi ihe ọzọ di. Manu ahu we kwusi.
7. O we bia, gosi onye nke Chineke. Ọ si, Je, re manu ahu, kwua ugwọ-gi, gi onwe-gi na umu-gi ndikom were nke fọduru di ndu.
8. Ubọchi we rue, na Elaisha gabigara rue Shunem, ma otù nwayi uku nọ n'ebe ahu; o rugide ya ka o rie nri. O rue, mb͕e ọ bula ọ nāgabiga, na o wezugara onwe-ya ba n'ebe ahu iri nri.
9. Nwayi ahu we si di-ya, Biko, le, amawom na onye di nsọ nke Chineke ka ọ bu, bú onye a nagabiga n'akuku ayi mb͕e nile.
10. Biko, ka ayi me ime-ulo-elu ntà nke mb͕idi; ka ayi dọba-kwa-ra ya n'ebe ahu ihe-ndina, na table, na oche, na ihe-idọba-oriọna: o gēru kwa, mb͕e ọ biakutere ayi, na ọ gēwezuga onwe-ya ba n'ebe ahu.
11. Ubọchi we rue, na ọ biara n'ebe ahu, wezuga onwe-ya ba n'ime-ulo-elu ahu, dina n'ebe ahu.
12. Ọ si Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Kpọ nwayi Shunem nka. O we kpọ ya, o we guzo n'iru ya.
13. Elaisha we si Gihezi, Biko, si ya, Le, i werewo ncheb͕u a nile cheb͕u onwe-gi bayere ayi; gini ka agēmere gi? ọ̀ bu igwa eze okwu bayere gi, ma-ọbu igwa onye-isi usu-ndi-agha? Ọ si, N'etiti ndim ka mu onwem nēbi.
14. Ọ si, Gini kwa ka agēmere ya? Gihezi we si, N'ezie ọ nweghi nwa-nwoke, di-ya aghọwo kwa agadi.
15. Ọ si, Kpọ ya. O we kpọ ya, nwayi ahu we guzo n'ọnu-uzọ.
16. Ọ si, Na mb͕e nka akara àkà, dika mb͕e a aka-nile, gi onwe-gi ganāb͕aku nwa-nwoke. Ọ si, É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha.