2. Ndi-Eze 4:28-35 Bible Nso (IGBOB)

28. O we si, Àriọrọm nwa-nwoke n'aka onye-nwem? àsighm, Arafulam?

29. O we si Gihezi, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were kwa nkpa-n'akam n'aka-gi, je: mb͕e i zutere nwoke ọ bula, ekelela ya; mb͕e nwoke ọ bula gēkele gi, azala ya: tukwasi nkpa-n'akam n'iru nwa-okoro ahu.

30. Nne nwa-okoro ahu we si, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi ma-ọli. O we bilie, jeso ya.

31. Gihezi we gabiga n'iru ha, tukwasi nkpa-n'aka ahu n'iru nwa-okoro ahu; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di. O we jeghachi izute ya, gosi ya, si, Nwa-okoro ahu etetaghi.

32. Elaisha we bata n'ulo ahu, ma, le, nwa-okoro ahu anwuwo, atọb͕ọ-kwa-ra ya n'ihe-ndina-ya.

33. O we ba, mechibido ha abua uzọ kpere Jehova.

34. Ọ rigo, dina n'elu nwata ahu, tukwasi ọnu-ya n'ọnu-ya, na anya-ya abua n'anya-ya abua, na ọbu-aka-ya abua n'ọbu-aka-ya abua, ruru ala n'elu ya: anu-aru nwata ahu we di ọku.

35. O we biaghachi, jegharia iru na azu n'ulo otù ub͕ò; ọ rigo, ruru kwa n'elu ya: nwa-okoro ahu we ze uzere rue ub͕ò asa, nwa-okoro we saghe anya-ya abua.

2. Ndi-Eze 4