19. Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula.
20. O rue n'ututu, na, mb͕e anēsure onyinye-inata-iru-ọma, le, miri nēsi n'uzọ Edom bia, ala we juputa na miri.
21. Moab nile we nu na ndi-eze ahu arigotawo ibuso ha agha, ha we kpọkọta onwe-ha, site n'onye ọ bula nke nēke onwe-ya ihe-ọkiké agha n'úkwù, we rigorue ndi bu okenye, ha we guzo n'ókè-ala-ha.
22. Ha we bilie n'isi-ututu, ma anyanwu mukwasiri miri ahu, Moab we hu miri ahu na ncherita-iru ha ka ọ nācha ọbara dika ọbara:
23. ha we si, Nka bu ọbara; ekpochapuwo ndi-eze ahu nọ̄, ha etib͕uwo kwa, nwoke ọ bula ibe-ya: ma ub͕u a, Moab, kwatanu ihe-nkwata.