2. Ndi-Eze 2:17-25 Bible Nso (IGBOB)

17. Ha we rugide ya rue mb͕e ihere mere ya, o we si, Ziganu. Ha we ziga ọgu ndikom abua na iri; ha we chọ ya ubọchi atọ, ma ha achọtaghi ya.

18. Ha we laghachikuru ya, ma ya onwe-ya nānọ na Jeriko; ọ si ha, Àsighm unu, Ejela?

19. Ndikom obodo ahu we si Elaisha, Biko, le, ọnọdu obodo a di nma, dika onye-nwem nāhu: ma miri-ya jọrọ njọ, ala nādighi-ekwe kwa ka ihe ka aka.

20. Ọ si, Wetaranum ọkwa ọhu, tiye-kwa-nu nnú nime ya. Ha we wetara ya.

21. Ọ pua je n'ebe miri si asuputa, o we tubà nnú n'ebe ahu, si, Otú a ka Jehova siri, Emewom ka miri a buru ihe inye ezi-ndu; ọnwu ma-ọbu ala nādighi-ekwe ka ihe ka aka agaghi-adi kwa ọzọ site n'ebe ahu.

22. Ewe me ka miri ahu buru ihe inye ezi-ndu rue ta, dika okwu Elaisha si di, nke o kwuru.

23. O si n'ebe ahu rigorue Bet-el: ma mb͕e ya onwe-ya nārigo n'uzọ, umu-okoro siri n'obodo puta, we kwa ya emò, si ya, Rigo, onye-isi-nkwọcha; rigo, onye-isi-nkwọcha.

24. Ọ le anya n'azu-ya, hu ha, kọcha ha n'aha Jehova. Nne anu-ọhia bear abua we si n'oké ọhia puta, dọka ọgu umu-okoro abua na abua n'etiti ha.

25. O si n'ebe ahu jerue ugwu Kamel, si kwa n'ebe ahu laghachi na Sameria.

2. Ndi-Eze 2