2. Ndi-Eze 19:32-37 Bible Nso (IGBOB)

32. N'ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n'obodo a, ọ gaghi-ab͕a kwa otú àkú n'ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n'iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya.

33. N'uzọ o siri bia, n'uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n'obodo a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

34. M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.

35. O rue, n'abali ahu, na mọ-ozi nke Jehova puru, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.

36. Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.

37. O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2. Ndi-Eze 19