5. O rue, mb͕e ala-eze di ike n'aka-ya, na o tib͕uru ndi-orù-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya:
6. ma o meghi ka umu nke ndi-otib͕u-madu ahu nwua: dika nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses si di, nke Jehova nyere n'iwu, si, Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.
7. Ya onwe-ya tib͕uru Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù ndikom na nnù ise, were kwa Sela n'agha, kpọ aha-ya Jokteel, rue ta.
8. Mb͕e ahu Amazaia zigara ndi-ozi jekuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jihu, bú eze Israel, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru.
9. Jehoash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.
10. I tib͕uwo Edom n'ezie, obi-gi we bulie gi elu: ka asọpuru gi na nka, nọdu kwa n'ulo-gi; ma n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?