2. Ndi-Eze 12:10-20 Bible Nso (IGBOB)

10. O rue, mb͕e ha huru na ego ahu riri nne n'ib͕e ahu, na ode-akwukwọ eze na onye-isi-nchu-àjà rigoro, ke ego ahu n'ihe, gu kwa ya, bú nke achọtara n'ulo Jehova.

11. Ha we nye ego ahu nke atùrù atù n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova: ha we weputa ya nye ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, bú ndi nālu ọlu n'ulo Jehova,

12. nye kwa ndi nēdo nkume, nye kwa ndi nāwa nkume, na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo Jehova di ike, na ikwu ugwọ ihe nile nāputara ulo ahu ime ka ọ di ike.

13. Otú ọ di, emeghi iko ọla-ọcha, na ihe-ikpakepu-ọku, na ọkwa-nwusa, na opì, ihe ọla-edo ọ bula, ma-ọbu ihe ọla-ọcha, nye ulo Jehova, site n'ego nke anēwebata n'ulo Jehova:

14. n'ihi na ọ bu ndi nēje ozi ahu ka ha nyere ya, were kwa ya me ka ulo Jehova di ike.

15. Ha na ndikom ahu, ndi ha nēnye ego n'aka-ha inye ndi n'eje ozi ahu, agughi ego ahu: n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obí ka ndi ahu nēme ihe.

16. Adighi-ewebata ego àjà-ikpe-ọmuma na ego àjà-nmehie n'ulo Jehova: ọ bu ndi-nchu-àjà nwe ya.

17. Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem.

18. Jehoash, bú eze Juda, we chiri ihe nsọ nile nke Jehoshafat, na Jehoram, na Ehazaia, nna-ya-hà, bú ndi-eze Juda, doro nsọ, na ihe nsọ ya nile, na ọla-edo nile anāchọta n'àkù nile nke ulo Jehova, na nke ulo eze, zigara Hazael, bú eze Siria: o we si na Jerusalem rigo.

19. Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

20. Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n'ulo Milo, n'uzọ nke nāridaru Sila.

2. Ndi-Eze 12