2. Ndi-Eze 11:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile ndi nwe ala-eze la n'iyì.

2. Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.

3. O we nọ n'aka-ya n'ulo Jehova nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.

4. Ma n'arọ nke-asa Jehoiada zigara chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi diri ndi-Karait, na ndi diri ndi-ọb͕a-ọsọ, o me ka ha bakute ya n'ulo Jehova; ya na ha we b͕a ndu, o me ka ha ṅua iyi n'ulo Jehova, o me kwa ka ha hu nwa eze.

5. O we nye ha iwu, si, Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ganēdebe kwa ihe-ndebe ulo eze;

6. otù uzọ n'uzọ atọ gādi kwa n'ọnu-uzọ-ama Sua; otù uzọ n'uzọ atọ gādi kwa n'ọnu-uzọ-ama n'azu ndi-ọb͕a-ọsọ: unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ulo a, buru ihe-nb͕ochi.

7. Ma usu abua ahu nime unu, bú ndi nile nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha gēdebe kwa ihe-ndebe ulo Jehova buruburu eze.

8. Unu gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata nime akuku-unu, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nāpu n'èzí, na mb͕e ọ nābà nime.

9. Ndi-isi usu ọgu ndikom ise we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha we biakute Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.

10. Onye-nchu-àjà we nye ndi-isi usu ọgu ndikom ise ube na ọta nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n'ulo Jehova.

11. Ndi-ọb͕a-ọsọ we guzo, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya, site n'akuku aka-nri ulo rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n'akuku ebe-ichu-àjà na n'akuku ulo, n'akuku eze buruburu.

12. O we me ka nwa eze puta, o kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà; ha we me ya eze, te ya manu, kua aka-ha, si, Ka eze di ndu.

13. Atalaia we nu olu ndi-ọb͕a-ọsọ na nke ndi Juda, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova:

2. Ndi-Eze 11