6. Ma ekweghm okwu nile ha, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera uba amam-ihe-gi: i tukwasiwo ihe n'akukọ nke m'nuru.
7. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.
8. Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze-Ya, iburu Jehova, bú Chineke-gi, eze: n'ihi na Chineke-gi huru Israel n'anya, ime ka ha guzo rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.
9. O nye eze ọgu talent ọla-edo isi, na uda di iche iche n'uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: ọ dighi uda di ka uda ahu nke eze-nwayi Sheba nyere eze, bú Solomon.
10. Ọzọ kwa, ndi-orù Huram, na ndi-orù Solomon, ndi siri n'Ofia bubata ọla-edo, bubatara osisi algum na nkume di oké ọnu-ahia.
11. Eze we were osisi algum ahu mere ulo Jehova, me-kwa-ra ulo eze, ebe-njeghari di elu, o were kwa ha mere ndi nābù abù ubọ-akwara na une: akāhughi osisi dika osisi ahu n'ala Juda.
12. Eze, bú Solomon, nye-kwa-ra eze-nwayi Sheba ihe nile nātọ ya utọ, ihe ọ bula ọ riọrọ, nāgughi ihe o butere eze. O we chigharia, la n'ala-ya, ya onwe-ya na ndi-orù-ya.
13. Ma ọtùtù ọla-edo nke biakutere Solomon n'otù arọ di nnù talent ọla-edo na ọgu iri-na-atọ na isi;
14. nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia na ndi-ahia wetara: eze nile nke Arebia na ndi nāchi ala nēweta-kwa-ra Solomon ọla-edo na ọla-ọcha.
15. Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù Shekel ọla-edo etisara etisa na ọgu iri bàra n'otù ọta uku.
16. O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; ọgu shekel ọla-edo iri-na-ise bàra n'otù ọta: eze we tiye ha n'ulo oké ọhia Lebanon.
17. Eze me-kwa-ra oké oche-eze nnọdu ọdu, machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa.
18. Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, na ihe-nb͕akwasi-ukwu eji ọla-edo me, ejikọrọ ha na oche-eze ahu, aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'elu ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu.
19. Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula.
20. Ihe nile eze, bú Solomon, nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: agughi ọla-ọcha n'ihe ọ bula n'ubọchi Solomon.
21. N'ihi na eze nwere ub͕ọ-nke nējeru Tashish nēso ndi-orù Huram: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo.