2. Ihe Emere 9:16-23 Bible Nso (IGBOB)

16. O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; ọgu shekel ọla-edo iri-na-ise bàra n'otù ọta: eze we tiye ha n'ulo oké ọhia Lebanon.

17. Eze me-kwa-ra oké oche-eze nnọdu ọdu, machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa.

18. Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, na ihe-nb͕akwasi-ukwu eji ọla-edo me, ejikọrọ ha na oche-eze ahu, aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'elu ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu.

19. Ọdum iri na abua we nēguzo n'ebe ahu n'elu ihe-nrigo isi ahu n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ: emeghi ya otú a nye ala-eze ọ bula.

20. Ihe nile eze, bú Solomon, nwere, bú nke eji aṅu ihe, bu ọla-edo, ihe nile nke ulo oké ọhia Lebanon bu kwa ọla-edo makarisiri nma: agughi ọla-ọcha n'ihe ọ bula n'ubọchi Solomon.

21. N'ihi na eze nwere ub͕ọ-nke nējeru Tashish nēso ndi-orù Huram: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo.

22. Eze, bú Solomon, we di uku kari eze nile nke uwa n'àkù na amam-ihe.

23. Eze nile nke uwa we nāchọ iru Solomon, inu amam-ihe-ya, nke Chineke tiyere n'obi-ya.

2. Ihe Emere 9