5. Ma mb͕e ekwusara okwu ahu, umu Israel nyere nkpuru mbu nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, na nke manu-aṅu, na nke ihe-ọmume nile nke ubi, n'uba; otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile ka ha bubatara n'uba.
6. Umu Israel na Juda, ndi bi n'obodo Juda nile, ndi ahu bubata-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nsọ nke edoro nsọ nye Jehova, bú Chineke-ha, ha we tinye aha n'obo n'obo.
7. N'ọnwa nke-atọ ka ha malitere itọ ntọ-ala nke obo ahu, n'ọnwa nke-asa ka ha tubìri ha.
8. Hezekaia na ndi-isi we bia hu obo nile, gọzie Jehova, na ndi-Ya, bú Israel.
9. Hezekaia we jua ndi-nchu-àjà na ndi Livai ajuju bayere obo ahu.
10. Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n'ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n'uba: n'ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a.
11. Hezekaia we si ka edozie ime-ulo n'ulo Jehova; ha we dozie.
12. Ha we bubata àjà-nbuli, na otù uzọ n'uzọ iri, na ihe nsọ nile, n'ikwesi-ntukwasi-obi: ma otù onye-ndú nāchi ha bu Konanaia onye Livai, Shimai nwa-nne-ya bu kwa nke-abua.
13. Na Jehiel, na Azazaia, na Nehat, na Asahel, na Jerimot, na Jozabad, na Eliel, na Ismakia, na Mehat, na Benaia, bú ndi-nlekọta n'okpuru aka Konanaia na Shimai nwa-nne-ya, site n'otú Hezekaia, bú eze, na Azaraia, bú onye-ndú ulo Chineke, mere ha ndi-nlekọta.
14. Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n'akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile.
15. Iden, na Miniamin, na Jeshua, na Shemaia, na Amaraia, na Shekanaia, nọ kwa n'aka-ya, n'obodo ndi-nchu-àjà, n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, inye umu-nne-ha ihe n'òkè, bú inye onye ntà otú anēnye onye uku:
16. nāgughi ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha nke ndikom, site na ndi b͕ara arọ atọ we ga n'iru, bú onye ọ bula nke nābà n'ulo Jehova, ilu ọlu ubọchi n'ubọchi-ya, ifè òfùfè-ha n'ihe-ndebe nile ha dika òkè nile ha si di;
17. na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi-nchu-àjà dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ndi Livai site na ndi b͕ara orú arọ we ga n'iru, n'ihe-ndebe nile ha n'òkè nile ha;
18. na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'etiti umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndinyom, nime nkpọkọta Israel nile: n'ihi na n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, ka ha doro onwe-ha nsọ n'idi-nsọ:
19. umu Eron kwa, bú ndi-nchu-àjà, ndi nọ n'ọhia nke ebe-ita-nri obodo-ha, n'obodo nile ọ bula, ha nwere ndikom ndi akpọrọ n'aha n'aha, inye ndikom nile n'etiti ndi-nchu-àjà òkè-ha, inye kwa ndi nile ndi di n'akwụkwọ-osuso-ọmumu n'etiti ndi Livai.