2. Ihe Emere 31:14-17 Bible Nso (IGBOB)

14. Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n'akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile.

15. Iden, na Miniamin, na Jeshua, na Shemaia, na Amaraia, na Shekanaia, nọ kwa n'aka-ya, n'obodo ndi-nchu-àjà, n'ọnọdu-ha, bú nke ndi kwesiri ntukwasi-obi, inye umu-nne-ha ihe n'òkè, bú inye onye ntà otú anēnye onye uku:

16. nāgughi ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha nke ndikom, site na ndi b͕ara arọ atọ we ga n'iru, bú onye ọ bula nke nābà n'ulo Jehova, ilu ọlu ubọchi n'ubọchi-ya, ifè òfùfè-ha n'ihe-ndebe nile ha dika òkè nile ha si di;

17. na ndi di n'akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi-nchu-àjà dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ndi Livai site na ndi b͕ara orú arọ we ga n'iru, n'ihe-ndebe nile ha n'òkè nile ha;

2. Ihe Emere 31