10. Ub͕u a ọ di n'obim ka ayi na Jehova, bú Chineke Israel, b͕a ndu, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe ayi nọ chigharia.
11. Umum, ub͕u a unu ejehiela: n'ihi na ọ bu unu ka Jehova rọputara iguzo n'iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi na ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
12. Ndi Livai we bilie, bú Mehat nwa Amasai, na Joel mwa Azaraia, ndi sitere n'umu ndi Kohat: na Kish nwa Abdi, na Azaraia nwa Jehalelel, ndi sitere n'umu Merari: na Joa nwa Zima, na Iden nwa Joa, ndi sitere na ndi Giashon:
13. na Shimri na Jeuel, ndi sitere n'umu Elizafan: na Zekaraia na Matanaia, ndi sitere n'umu Esaf: