1. Ndi nile nke Juda we were Uzaia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia.
2. Ya onwe-ya wuru Ilot, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n'ọnwu.
3. Arọ iri na isi ka Uzaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekilia nke Jerusalem.
4. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere.
5. O we nọ n'ichọ Chineke n'ubọchi Zekaraia, onye nwere nghọta n'ihu Chineke: ma n'ubọchi ọ nāchọ Jehova, Chineke mere ka ihe gara ya nke-ọma.
6. O we pua, buso ndi Filistia agha, tipúsia mb͕idi Gat, na mb͕idi Jabne, na mb͕idi Ashdod, o we wue obodo n'ala Ashdod na n'etiti ndi Filistia.
7. Chineke we yere ya aka imegide ndi Filistia, na imegide ndi Arebia ndi bi na Gua-beal, na Meunim.
8. Ndi Amon we nye Uzaia onyinye-inata-iru-ọma: aha-ya we rue nbata Ijipt; n'ihi na o mere onwe-ya ka ọ di ike ri nne.
9. Uzaia wu-kwa-ra ulo-elu nime Jerusalem n'ọnu-uzọ-ama nkuku, na n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, na na nkuku mb͕idi, we me ka ha di ike.
10. O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n'ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n'ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n'ebe di ala ala, ma n'ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n'ugwu na nime Kamel; n'ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n'anya.