Amazaia we kewapu ha, bú usu ndi nāpunara madu ihe nke siri n'Efraim biakute ya, ka ha laghachi n'ebe-ha: iwe-ha we di ọku nke-uku megide Juda, ha we laghachi n'ebe-ha n'iwe di ọku.