13. Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Chinekem gāsi, nke ahu ka m'gēkwu.
14. O we biakute eze, eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ọ si, Rigonu, ka ihe ga-kwa-ra unu nke-ọma; agēnye kwa ha n'aka-unu.
15. Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova?
16. Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo.
17. Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama nke ihe ọjọ?
18. Ọ si, N'ihi nka nurunu okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya.
19. Jehova we si. Ònye gārafu Ehab, bú eze Israel, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Otù onye nke nēkwu okwu we si otú a, onye ọzọ nke nēkwu okwu si kwa otú a.
20. Mọ ahu we puta, guzo n'iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya. Jehova we si ya, Gini ka i gēji?
21. Ọ si, M'gāpu, buru mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a.
22. Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi.
23. Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu?
24. Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi.