1. Samuel 20:30-39 Bible Nso (IGBOB)

30. Iwe Sọl we di ọku megide Jonatan, ọ si ya, Gi nwa nke nwayi b͕agọrọ ab͕agọ nke nānupu kwa isi, àmaghm na gi onwe-gi nārọputa nwa Jesi ibu ihe-ihere-gi na ibu ihe-ihere ọtọ nne-gi?

31. N'ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n'elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n'ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu.

32. Jonatan we za Sọl nna-ya, si ya, N'ìhi gini ka agēme ka ọ nwua? Gini ka o meworo?

33. Sọl we tua ya ube-ya itub͕u ya: Jonatan we mara na nna-ya zubesiri ihe ahu ike, bú ime ka Devid nwua.

34. Jonatan we si na table bilie n'iwe di ọku, o righi kwa nri n'ubọchi nke-abua nke ọnwa ahu: n'ihi na o wutara ya n'ihi Devid, n'ihi na nna-ya mere ya ihe-ihere.

35. O rue, n'ututu, na Jonatan puru je n'ọhia na mb͕e ya na Devid kara àkà, otù nwatakiri-nwoke so kwa ya.

36. Ọ si nwa-okoro-ya, B͕a ọsọ, biko chọta àkú nile nke mu onwem nāb͕a. Mb͕e nwa-okoro ahu nāb͕a ọsọ, ya onwe-ya we b͕a àkú, me ka ọ gabiga ya.

37. Nwa-okoro ahu we biarue ebe àkú ahu di, bú nke Jonatan b͕ara, Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Àkú ahu, ọ̀ dighi n'akuku iru gi?

38. Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya.

39. Ma nwa-okoro ahu amaghi ihe ọ bula: nání Jonatan na Devid mara okwu ahu.

1. Samuel 20