1. Ndi Kọrint 8:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo.

2. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya mara ihe ọ bula, ọ kāmaghi dika ọ nāghaghi ima;

3. ma ọ buru na onye ọ bula nāhu Chineke n'anya, onye ahu ka Chineke mara.

4. Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n'àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n'uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù.

5. N'ihi na asi na ọ bu kwa ezie na ndi anākpọ chi di, ma ọ bu n'elu-igwe ma-ọbu n'elu uwa; dika ọtutu chi na ọtutu ndi-nwe-madu di;

6. ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.

1. Ndi Kọrint 8