32. Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n'Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.
33. Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.
34. Sinu n'ura manya teta n'uzọ ezi omume, unu emehie-kwa-la; n'ihi na ufọdu nēnwe amaghi-ihe bayere Chineke: anamekwu nka ka m'me unu ihere n'iru.
35. Ma otù onye gāsi, Èsi aṅa eme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie? ọ̀ bu kwa ahà aru gini ka ha ji bia?
36. Onye nēnweghi uche, adighi-eme ka nkpuru gi onwe-gi nāgha di ndu, ma ọ buru na ọ nwughi anwu:
37. ihe i nāgha kwa, ọ bughi aru gāputa ka i nāgha, kama ọ bu nkpuru efu, ma eleghi anya ọ gābu ọka, ma-ọbu nkpuru ọ bula nime nkpuru fọduru;
38. ma Chineke nēnye ya aru dika Ọ chọrọ, nēnye kwa nkpuru ọ bula nime nkpuru nile aru nke aka ya.
39. Anu-aru nile abughi otù anu-aru: kama otù anu-aru nke madu di, anu-aru ọzọ nke anumanu di kwa, anu-aru ọzọ nke nnunu di kwa, anu-aru ọzọ nke azù di kwa.
40. Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa: ma ebube nke aru nke elu-igwe bu otù, ebube nke aru nke uwa di kwa iche.
41. Otù ebube nke anyanwu di, ebube ọzọ nke ọnwa di kwa, ebube ọzọ nke kpakpando di kwa; n'ihi na otù kpakpando di iche n'aru kpakpando ọzọ n'ebube.
42. Otú a ka nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu di kwa. Anāgha ya n'ire-uré; anēme ka o si n'ọnwu bilie n'ereghi-uré: