8. Umu-ndikom Bekea kwa; Zemira, na Joash, na Elieza, na Elioenai, na Ọmri, na Jeremot, na Abaija, na Anatot, na Alemet. Ndia nile bu umu-ndikom Bekea.
9. Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, dika osuso-ọmumu nile ha si di, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri na ọgu iri.
10. Umu-ndikom Jediael kwa; Bilhan: umu-ndikom Bilhan kwa; Jeush, na Benjamin, na Ihud, na Keneana, na Zetan, na Tashish, na Ahishaha.
11. Ndia nile bu umu Jediael, dika ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù atọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha ibu agha.
12. Shupim kwa, na Hupim, bú umu Ia, na Hushim, bú umu Ahea.
13. Umu-ndikom Naftali; Jahaziel, na Guni, na Jiza, na Shalum, bú umu Bilha.
14. Umu-ndikom Manase; Asriel, onye nwunye-ya muru: (iko-ya nwayi, bú nwayi Eram, muru Makia nna Gilead:
15. Makia we luru nwunye n'etiti Hupim na n'etiti Shupim, aha nwa-nne-ya nwayi bu kwa Meaka;) aha nwa nke-abua bu kwa Zelọfehad: ma Zelọfehad nwere umu-ndinyom.
16. Meaka, bú nwunye Makia, we mua nwa-nwoke, o we kpọ aha-ya Peresh; aha nwa-nne-ya nwoke bu Sheresh; umu-ya ndikom bu Ulam na Rakem.
17. Umu-ndikom Ulam kwa; Bedan. Ndia bu umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase.
18. Nwa-nne-ya nwayi, bú Hamoleket, we mua Ishhod, na Abieza, na Mahla.
19. Umu-ndikom Shemida bu kwa Ahian, na Shekem, na Likhi, na Aniam.
20. Umu-ndikom Efraim kwa; Shutela, na Bered nwa-ya, na Tahat nwa-ya, na Eleada nwa-ya, na Tahat nwa-ya,