1. Ma umu-ndikom Isaka; Tola, na Pua, na Jashub, na Shimron, anọ.
2. Umu-ndikom Tola kwa; Uzi, na Refaia, na Jeriel, na Jahmai, na Ibsam, na Shemuel, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú ndi nke Tola; ha bu ndi-dike bu dìnkpà n'osuso-ọmumu nile ha: ọnu-ọgugu-ha n'ubọchi Devid di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-isi na ọgu iri.
3. Umu-ndikom Uzi kwa; Izrahia: umu-ndikom Izrahia kwa; Maikael, na Obadaia, na Joel, na Ishia, ise: ndi-isi ka ha nile bu.
4. Usu ndi nāpunara madu ihe nke usu-ndi-agha so-kwa-ra ha, n'osuso-ọmumu-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù iri: n'ihi na ha nwere ọtutu ndinyom na umu-ndikom.
5. Umu-nne-ha kwa nke ab͕uru nile nke Isaka, ndi-dike bu dìnkpà, di orú nnù uzọ iri na nnù iri-na-asa na ọgu iri, edewo ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu.
6. Umu-ndikom Benjamin; Bela, na Bekea, na Jediael, atọ.
7. Umu-ndikom Bela kwa; Ezbon, na Uzi, na Uziel, na Jerimot, na Iri, ise; ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ndi-dike bu dìkpà; edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na orú na iri na anọ.
8. Umu-ndikom Bekea kwa; Zemira, na Joash, na Elieza, na Elioenai, na Ọmri, na Jeremot, na Abaija, na Anatot, na Alemet. Ndia nile bu umu-ndikom Bekea.
9. Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, dika osuso-ọmumu nile ha si di, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri na ọgu iri.
10. Umu-ndikom Jediael kwa; Bilhan: umu-ndikom Bilhan kwa; Jeush, na Benjamin, na Ihud, na Keneana, na Zetan, na Tashish, na Ahishaha.