1. Ihe Emere 29:24-30 Bible Nso (IGBOB)

24. Ndi-isi nile, na ndi-dike, na umu-ndikom nile kwa nke eze, bú Devid, kweye-kwa-ra inọ n'okpuru Solomon, bú eze.

25. Jehova we me ka Solomon di uku ri nne n'anya Israel nile, O we tiyekwasi ya ebube ala-eze nke anātukwasighi eze Israel ọ bula nke buru ya uzọ.

26. Ma Devid nwa Jesi bu eze Israel nile.

27. Ma ubọchi nile ọ bu eze Israel di ọgu arọ abua; arọ asa ka ọ bu eze na Hebron, orú arọ na iri na atọ ka ọ bu kwa eze na Jerusalem.

28. O we nwua n'ezi isi-awọ, ubọchi nile nke ndu-ya na àkù na nsọpuru ju-kwa-ra ya afọ: Solomon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

29. Ma ihe nile Devid, bú eze, mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'akwukwọ ihe emere nke Gad, bú onye-ọhu-uzọ;

30. tiyere ọbubu-eze-ya nile, na idi-ike-ya, na mb͕e nile nke gabigara n'isi ya, na n'isi Israel, na n'isi ala-eze nile nke ala di iche iche.

1. Ihe Emere 29