16. Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala.
17. Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti.
18. Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.
19. Devid we rigo n'okwu Gad nke o kwuru n'aha Jehova.