2. N'ub͕ọ-ala mbu ka inyinya nācha uhie uhie di; n'ub͕ọ-ala nke-abua ka inyinya nēji nji di;
3. n'ub͕ọ-ala nke-atọ ka inyinya nācha ọcha di; n'ub͕ọ-ala nke-anọ ka inyinya turu agwa nwe-kwa-ra ume di.
4. M'we za, si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Gini bu ndia, onye-nwem?
5. Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n'iguzo onwe-ha n'iru Onye-nwe uwa nka nile pua.
6. Ub͕ọ-ala ahu nke inyinya nēji nji di nime ya nāpuru ala Ugwu; nke nācha ọcha puso-kwa-ra ha; nke turu agwa puru-kwa-ra ala Ndida.